Getting your Trinity Audio player ready...
|
Ihe E kwuru: Prince Saviour onye akara x ya bụ GRV PR, kwuru na David Nwaze Umahi rụrụ akwa okporo ụzọ di 23 nke n’enweghiebe esi ya aga.

Ihe Anyi chọpụtara: Ugha! DUBAWA chọpụtara site n’akara Facebook Francis Nwaze bụ onye enyemaka pụrụiche nye David Umahi na mgbasa ozi mgbe ọ bụ gọvanọ Ebonyi steeti, kọwara na David Umahi rụrụ akwa okporo ụzọ di 13, ebe 10 n’ime ha gbara abụọ abụọ. Anyi choputara na okporo ụzọ ndi a nwere uru ha bara ndi Ebonyi.
Akụkọ n’uju
Akụkọ Prince Saviour onye na-ahụ maka akụkọ mmekọrịta ọha na eze nke Rhodes Vivour dere na X kwuru na akwa okporo ụzọ 23 David Umahi, minista n’ahụ maka ọrụ na Nigeria, rụrụ oge ọ bụ gọvanọ steeti Ebonyi enweghị uru ọ bara ndi Ebonyi. N’akụkọ o bipụtara, mmadụ kariri 80,000 hụrụ akụkọ ahụ.
Gbadebo Rhodes-Vivour bụbu onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị na Lagos dọrọ ọkwa Gọvanọ na steeti Lagos n’afọ 2023.
Nyocha: Ọbụghi eziokwu na David Umahi rụrụ akwa okporo ụzọ di 23 na steeti Ebonyi, dika GRV PR siri dee, kama ọ rụrụ akwa okporo ụzọ 13 nke n’ime, iri 10 gbara abụọ abụọ.
Mgbe DUBAWA gara n’akara Facebook Francis Nwaze bụ onye enyemaka pụrụiche na mgbasa ozi nye David Umahi oge ahụ, ọ kọwara na Maazi Umahi rụrụ akwa okporo ụzọ di iri na 13 ebe 10 n’ime ha gbara abụọ abụọ n’ihi nke a, ka ha jiri kwuo na David Nwaze Umahi rụrụ akwa okporo ụzọ di 23 na steeti Ebonyi.
Anyị chọpụtara ụfọdụ akwa okporo ụzọ ndi a gunyere, nke gawara ọdụ ụgbọ elu steeti, nke di Abomega, nke di na Presco, nke di na Iyere Edda nke nọ na kansul ime obodo Afikpo South, Ohaukwu, enwere n’Uburu di na kansul ime obodo Ohaozara nakwa na Abakaliki. Ministry of works Abakaliki Ebonyi gosiri ụfọdụ foto ebe ese pụtara akwa okporo ụzọ ndi a.
Mgbe anyị jụrụ ụfọdụ ndị mmadu na Ebonyi, ha kwuru sị na akwa okporo ụzọ ndi a nwere uru ha bara.
Nchikota : Nyocha anyị mere na-egosi n’ihe enwere bụ akwa okporo ụzọ di 13 ọ bụghị 23 dika Maazi Saviour siri dee na X.
Emepụtara akụkọ a maka 2024 Kwame KariKari Language Fact Check Fellowship Project nke DUBAWA na mmekorita ya na Toast 90.3FM Owerri, iji kwado ụkpụrụ nke “eziokwu” na akwụkwọ akụkọ na ịkwalite mmuta mgbasa ozi na mba ahụ.