Fact CheckFacebook ChecksHealthIgbo

Nyocha Eziokwu: Acha-ere ọ bụ orịa emere eme?

Getting your Trinity Audio player ready...

Ihe E Kwuru: Ọtụtụ ndị mmadụ, okachasi ndịgbo, kwenyere na ọrịa acha ere bụ ihe mmadụ mere eme. Onye nọ na  Facebook aha ya bu  Igu Uchechukwu  Agbafor  kwuru na ndị ịro ya emeela ya acha-ere. Ndị mmadu kwenyere na acha ere abụghị ọrịa eji ọgwụ oyibo agwọ.

Nyocha Eziokwu: Acha-ere ọ bụ orịa emere eme?

Akụkọ N’uju 

Na ọnwa Nọvemba afọ 2022, otu nwoke aha ya bụ Ịgụ Uchechukwu Agbafor dere na Facebook, ma wepụta foto wee kwuo na ndi iro ya emeela ya  acha-ere. 

Ọtụtụ mmadụ nọ Facebook n’egosi na ha kwenyere na mmadụ na-eme ibe ya acha-ere. Ọ siri n’ụfọdụ mgbe, ha na-ere ya naira iri ise, rute nari naira ise.

Ebe Ojebe Ogene Tv na Facebook kwukwara na ya n’agwọ acha-ere ya ala kpamkpam. Ọ gwara mmadu 74,000 na-eso ya na onye ọ bụla mmadụ mere ma ọ bụ ndi ọjọọ mere acha-ere ka ha kpọtụrụ ya ozigbo. 

Gịnị bụ Ọrịa Acha Ere?

Clevelandclinic kọwara acha-ere dika ọnyá ọbụla mere mmadụ n’ụkwụ ma jụụ ịla dika ọ gachara ịzụuka abụọ enyechara onye ahụ ọgwụ ndi kwesịrị ime ka ọnyá ahụ laa. 

Acha-ere na-emekarị n’ikpere ụkwụ ma ọ bụ nkwonkwo ụkwụ Ụdị ọnya na-agba mmiri ma ọ bụ abụ, ya bụrụ n’ọnya ahụ a gafee ọnwa atọ, nke a na-egosi n’ọnọdụ ya ajọọla njọ. 

Ebe ọbụla ọrịa acha-ere metụtara na-amalite icha ọbara ọbara, tupu ị mara ihe na-emenụ ebe ahụ azawala, tinyere nnukwu ụfụ ọ ga-afụ onye ahụ. 

Ụlọ ọrụ Healthline kọwara ụfọdụ ihe ndi n’ebute ọrịa, nke gụnyere, ọrịa shuga, ọbara mgbali elu, ọrịa obi, ọrịa mkpụrụ akụrụ, ọbara agazughi n’ime ahụ mmadụ etu okwesiri, ise ihe osise. 

Na mkparituka DUBAWA na dibia bekee na agwọ ọrịa elu ahụ, dọkịta Victor Okechukwu kọwara n’ọbụghị mmadụ na-eme ibe ya acha-ere kama ọ bụ ọtụtụ ihe nwereike ịkpata, dịka ọrịa obi, ọbara agbaghi dika okwesiri, ihe si n’agbụrụ . 

Dọkịta Okechukwu bụ onyeisi n’ụlọ ọrụ Medical Excellency Foundation For Africa nke bụ ụlọ n’agbasa ozi gbasara okwu ahụike ndi mmadụ.

O kwuru n’ihe mere o ji ewe  ọtụtụ oge  ị gwọ onye nwere ọrịa achara-ere, ọkachasi n’ala igbo nakwa na Naijiria bụ na ụfọdụ mgbe ha na-esite n’oge onye ahụ chọpụtara ya, ụdị ọnya nọ onye ahụ n’ahụ, ebe ụfọdụ bụ n’ihe si n’ime ọbara. 

Ọ kọwaa na ọrịa a nwere ike site n’ọbara anaghị agba nke ọma n’akwara na ihe ndị ọzọ. Ọ kwuru n’ọnya ndi mere n’ebe di etu ahụ, na-aratụ ahụ ịla beluso onye di etu a o nwetara onye ọkachamara. 

Nyocha nke National Institute of Health mere na steeti Lagos n’egosi na ndi bụ ọrịa mburupụta  ụwa akpọrọ sickle cell n’asụsụ bekee bụ ndi ọrịa kacha metuta. Ihe ịmatụ, mmadụ di 848 enyochara 14 n’ime ha nwere ọrịa a. 

Nchịkọta

Dọkịta Okechukwu gwara ndi mmadụ, ọkachasi ndi nwere ọrịa ọtọ biribiri, ka ha kwụsị ịche n’ọrịa acha-ere bụ ihe mmadụ ibe ha mere ha. 

Ịchọpụta ọrịa achara-ere n’oge bụ otu ụzọ esi agwọ ya. Nke ọzọ bụ ị gakwuru ndi dibia bekee ma nke ha riri nakwa ịhụ n’imere ihe ka ha si gwa gi  mee. 

Ebipụtara akụkọ a maka 2024 Kwame KariKari Language Fact Check Fellowship Project nke DUBAWA na mmekorita ya na Toast90.3fm Owerri, iji kwado ụkpụrụ nke “eziokwu” na akwụkwọ akụkọ na ịkwalite mmuta mgbasa ozi na mba ahụ

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Back to top button
Translate »