IgboEducationFacebook ChecksFact Check

Nyocha Eziokwu: Ụgha! Gọọmentị agaghị akwụ ndị NYSC copa puku naira  irí asaa na asaa

Getting your Trinity Audio player ready...

Ihe E Kwuru: Otu onye na Facebook bụ Ekerenam joy kwuru na ndi NYSC so na ndị gọọmentị ga-akwụ  puku naira irí asaa na asaa nke bụ ụgwọ kacha nta nke ọhụrụ malite na ụbọchị nke mbụ na  ọnwa May.

Nyocha Eziokwu: Ụgha! Gọọmentị agaghị akwụ ndị NYSC copa puku naira  irí asaa na asaa

Akụkọ n’uju

N’ọnwa April, afọ 2024, otu onye na Facebook bụ Ekerenam joy  kwuru na ndi NYSC so na ndị gọọmentị ga-akwụ  puku naira irí asaa na asaa nke bụ ụgwọ kacha nta nke ọhụrụ bịdo na ụbọchị nke mbụ na  ọnwa May.

Ọtụtụ ndị mmadụ nọ na Facebook kwenyere na ihe a Ekerenam Joy  kwuru. Mmadụ ruru irí atọ gosiri mmasi ha na ihe ọ dere na Facebook.

Gọọmenti Naijiria malitere ịkwụ ụgwọ kacha nta nke ọhụrụ puku naira irí atọ na afọ 2019. Ha malitere ịkwụ ndị NYSC copa puku naira irí atọ na atọ na  afọ 2020.

Nyocha

Nke mbụ, DUBAWA chọrọ ihe a Ekerenam Joy  kwụrụ na akwụkwọ akụkọ dị iche iche ama nke ọma, enweghị akwụkwọ akụkọ ọbụla anyị hụrụ ebe gọọmenti kwụrụ na ọga kwụ ndị NYSC copa  puku naira irí asaa na asaa ma ọ bụ mụbaa ụgwọ ọnwa kacha nta.

Anyi chọrọ na ọnya nwudude National Youth Service Corps, ma enweghị ebe ahụrụ ụdị akụkọ.

Anyị jụrụ mmadụ ole ma ole anyị maara bụ ndị NYSC copa ajụjụ, ha kwuru na ha anụbeghị ụdị akụkọ a, ma kwukwa na a ka na-akwụ ha puku naira  irí atọ na atọ.

Anyị kpọtụrụ onye nchịkọta ọrụ(state Coordinator) nke NYSC na steeti Imo bụ Rachel Idaewor, o kọwara na ya amaghị maka nke a, mana ọnọghị ya n’aka ikwu gbasara ma gọọmentị ebidola ikwụ ndị NYSC copa ego naira puku irí asaa na asaa.

Mgbe anyi juru ụlọ ọrụ NYSC ajuju site Facebook bụ officialnysc, nzaghachi ha nyere anyị ebe ahụ bụ ọ  bụghị eziokwu  

Nchịkọta

Gọọmentị Naijiriya agaghị akwụ ndị NYSC copa puku naira  irí asaa na asaa, a gaghị kwa agbanwe ụgwọ ọnwa kacha nta

Emepụtara akụkọ a maka 2024 Kwame KariKari Language Fact Check Fellowship Project nke DUBAWA na mmekorita ya na Toast 90.3FM Owerri , iji kwado ụkpụrụ nke “eziokwu” na akwụkwọ akụkọ na ịkwalite mmuta mgbasa ozi na mba ahụ.

Show More

Related Articles

Leave a Reply

Back to top button