Getting your Trinity Audio player ready...
|
Ihe E Kwuru: Otu onye nọ na X bụ 99% OPPRESSED na uboọchị asato n’onwa April kwụrụ na ndị Igbo so na ndị ọrụ na ọchịchị onyeisiala Bola Tinubu erughi mmadu abụo.
Ihe Anyi Chọpụtara: Ụgha! Site na nhọpụta onyeisiala Tinubu mere na afọ gara aga, DUBAWA hụrụ na ndị Igbo karịrị mmadụ ise so na ndị ndụmọdụ pụrụ iche na ọchịchị onyeisiala Bola Tinubu.
Akụkọ N’uju
Otu onye no na X bụ 99% OPPRESSED kwụrụ na onweghi ndi Igbo so na ndị ọrụ na ọchịchị onyeisiala Bola Tinubu.
N’okwu ya, 99% OPPRESSED siri n’ime ọtụtụ ndị ọrụ nọ na AsoRock, enweghị oburugodi ndị Igbo abụọ so na ọchịchị Tinubu. O kwupụtara na ọdị nwute si na kamgbe ọchịchị Tinubu bidoro na afọ gara aga, onweghi onye Igbo ọbula so arụ ọrụ.
Nyocha
Nke mbụ, DUBAWA chọpụtara na ọnwa Septemba na afọ gara aga, mgbe onyeisiala Tinubu hoputara mmadụ ise bụ ndị ndụmọdụ mgbasa ozi, otu onye nta akụkọ bụ Fredrick Nwabufo so na ndi ahoputara.
Ka akwụkwọ Punch sịri kọputa, Mazị Nwabufo, onye odeakụkọ na ọkachamara nzikọrịta ozi, ka a họpụtara ka ọ bụrụ onye enyemaka pụrụiche maka nkwekọrịta ọha.
Maazi Nwabufo bụ onye Ọba nke dị ná Idemili Local Government Area nke steeti Anambra, Nigeria
Onye Igbo ọzọ nke onyeisiala Tinubu hoputara na ndị ndụmọdụ pụrụ iche na ọchịchị ya bụ Chioma Nweze. Ahoputara Oriakụ Nweze dika onye ndụmọdụ pụrụ iche maka mmekọrịta obodo (South-East)
Oriakụ Nweze rụburu ọrụ dị ka kọmishọna na ahụ maka ahia na ochichi Dave Umahi, onye chiburu Steeti Ebonyi.
Na afọ gara aga (September 2023), onyeisiala Bola Tinubu hoputara Stanley Nkwocha dika ọnụ na-ekwuchitere osote onyeisiala Naijiria bụ Kashim Shettima. Stanley Nkwocha bụ onye nta akụkọ kemgbe afọ irí abụọ, na ọkachamara na ihe gbasara mgbasa ozi.
Onyeisiala Bola Tinubu hoputara ndị Igbo ịse bụ minista, ndị a gụnyere; Dave Umahi, Uju Kennedy, Nkiruka Onyejeocha, Uche Nnaji ya na Doris Uzoka-Anite.
Nchịkọta
Ihe onye no na X kwụrụ si na onweghi ndi Igbo ọbula so ndi ọrụ na ọchịchị onyeisiala Tinubu, bụ ụgha.
Emepụtara akụkọ a maka 2024 Kwame KariKari Language Fact Check Fellowship Project nke DUBAWA na mmekorita ya na CrimeFacts news, iji kwado ụkpụrụ nke “eziokwu” na akwụkwọ akụkọ na ịkwalite mmuta mgbasa ozi na mba ahụ